Exodus 23:14-19
Mmemme atọ a na-eme kwa afọ
14“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.15“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.
“Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.
16“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi, ▼ bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu.
“Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. ▼ Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.
17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
18“Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m.
“Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ. ▼
▼Ya bụ chi ọbụbọ
19“Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
“Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya. ▼
Copyright information for
IboBIU