Exodus 23:14-17

Mmemme atọ a na-eme kwa afọ

14“Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a.

15“Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.

“Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m.

16“Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi,
Aha ọzọ a na-akpọ mmemme owuwe ihe ubi bụ mmemme Izu, gụọ ya nʼakwụkwọ Ọpụ 34:22, nʼihi na ọ bụ izu asaa, mgbe Mmemme Ngabiga gafesịrị ka a na-eme ya. Ọ bụkwa nʼọgwụgwụ owuwe ihe ubi.
bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu.

“Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.
Mmemme nchịkọta mkpụrụ bụ ihe na-egosi na e wechaala ihe ubi. Dit 16:13
Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile.

17“Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

Copyright information for IboBIU