Joel 2:28-32

Ụbọchị Onyenwe anyị

28“Ma emesịa,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma.
Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m
ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
30Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe,
na nʼelu ụwa;
a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
31Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,
ọnwa ga-aghọkwa ọbara,
tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.
32Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị
ka a ga-azọpụta.
Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem
ka mgbapụta ga-adị,
dịka Onyenwe anyị kwuru ya.
Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ,
bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.
Copyright information for IboBIU